READ THE RHAPSODY OF REALITIES IN EHUGBO-IGBO DIALECT
Published Date:
Dec 1, 2024
Last Updated:
JISOS CHORỤ IHOM KADỤA MA NA IBE I NO
hụrụ m ta a na-amụ m. E deri ihe bayeri nkeizuha nke ndụ m na ẹkwwụkwọ gụ. E deturum ihe bayeri ụbọchị ọọbụla nke ndụm na ẹkwụkwọ gụ ta abalị mbụ m na-eyete isi. O Chineke, gịrị nke ọrịrị gị bayeri m na-amakasị. Ọ dịgị onye nworu ike ịgụkọ a ọnụ! (Ẹbụọma 139:16-17).Ụfọdị nde madụ na-asọ ụjọ ịhabu Jisọs na o weri ọnọdụ a na ndụ wo. Wo na-arịị na ọ je-ọgbanwo nrọ wo; nrọ wo na-arọ ẹkamgbe basịrị ndụ wo; atụmatụmatụm wo na-atụm ẹkamgbe bayeri nke wo chọrụ na ndụ wo dịị. Wo na-arịị na o je-odube wo na ihe wo aachọgagị omume, na ome na wo anaasọ ụjọ iso e.
Ndem na-arịm ya otue ọrịrị bụ ndem aamagị Jisọs. Maka na wo amagị onye Ọ bụ, wo nwogu ike ịtụkwasị A obu. Ya ọ bụrụ naị ata onye Ọ bụ, na ị mata nke a ga na-atụkwasị A obu. Rịa ọrịrị bayeri e: Ihe Ọ chọbugerim bụ ihom kadụa ma bayeri gi. Merini, I nworu ike iweri ndụ gụ tiyie na ẹka.
Onyenwoayị nworu mmetute na ihe ọọbụla bayeri gi. Ọ hụrụ gụ na ẹnya karịa nke ị hụrụ onwogu. O nworu mkpụkpụ bayeri gi, nke bụkwanụ na I meje nke ọma maa na enwo ọnwụ na mgbe ọọbụla.
O kwuru na Jeremaya 29:11, Onyenwoayị sịrị: “Maka na a maarịm mkpụkpụ m na-akpụ bayeri gi,” Mkpụkpụ ịbawaye gi, "ọbụgụ imeru gu ụhụ, mkpụkpụ ne nị gị olile ẹnya yaa ọdị na ihu.” Ọ dịgị onye ọzọ nwo yaa otue mkpụkpụ a bayeri gi. Ọ na ọrịtakọrụ madụ ihe dị na 3 Jọn 1:2, “Enyi m, onye m hụrụ na ẹnya, ekpere m bụ na ihe gajeri gi nke ọma, na ụhụ dị gị ma na ị baa ụba dịka nke mkpụrụ obu gu na-aba.” Rịa ọrịrị bayeri e!
Ọ bụ a meri Ọ nịrị gị ndụ A, ụmara ọma A, Ebubie, yaa Ẹha A; ma ị nwo ike ibu ndụ dagburu Ekwensu, mmehie, ụhụka, nrịa nrịa, adịgị ike dị iche iche, yaa ọnwụ. Otuto dịrị Ẹha A rue mgbe agwụ agwụ!
EKPERE
Nna nke Umara oma, ekele dịrị gi maka įhunaenya gị nke guzosiike na ibe m nọ yaa mkpukpụ gụ tọrọ atọ maka ndụ m. Ana ma tukwasituru gu obu m, mari na mkpukpụ gụ na ibe m nọ bụ ịbawaye m, nị m olile enya, yaa ịnị m odina ihu guzosi ike. Ahotawo m iso ntuzi ęka gị, nworu obu isi ike na eje m na-ebu ndu jufuteri na onwụ yaa ezumoke, na Eha Jisos. Amin.
Sinach